settings icon
share icon
Ajụjụ

Natawo Mgbaghara mmehie? Kedu etu m gà-èsi nata mgbaghara mmehie site na Chineke?

Azị̀za


Ọlụ Ndịozi 13:38 na-ekwupụta, “ya mere mara nụ nke a, ụmụnna m na a nà-èsite n’ọnụ onye à kwusaa mgbaghara mmehie niile nye ụnụ.”

Gịnị bụ mgbaghara mmehie, gịnị kpatakwara m ji nwee mkpa inwe ya?

Mkpụrụokwu a bụ “gbaghàra” pụtara ihicha sèleèti ka ọ dị ọcha, ịtọ̄pụ/ịhāpụ (onye kwesiri ịta ahụhụ), ịkàgbù ụgwọ̄. Mgbe anyị mehiere mmadụ, anyị nà-àchọ mgbaghara ha ka e wee weghachite mmekọrịta. A naghị enye mgbaghara maka na mmadụ kwesiri ka a gbaghara ya. Ọ dịghị onye kwesiri ka a gbaghara ya. Mgbaghara bụ òmùme nke ịhụnanya, ebere na amara. Mgbaghara bụ̀ mkpebi ejigideghi ihe megide onye ọzọ, na-agbanyeghi ihe ha/o mèrèlà gị.

Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na anyị niile nwere mkpa mgbaghara mmehie sitere nà Chineke. Anyị niile emeela mmehie. Eklisiastis 7:20 na-ekwuwàpụ̀ta “ọ dịghị onye eziomume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” 1 Jọn 1:8 na-asị, “ọ bụrụ na anyị asị na anyị enweghi mmehie, anyị nà-èduhie onwe anyị, eziokwu ahụ adịghị kwa n’ime anyị.” Mmehie niile bụ òmùme ịgbā mgba megide Chineke (Abụ Ọma 51:4). N’ihi nke a, anyị nwere, n’etu dị egwụ, mkpa mgbaghara mmehie nke Chineke. Ọ bụrụ na à gbaghàràghị̀ mmehie anyị, anyị gà-anọ̀ ebighi ebi na-àta ahụhụ ihe mmehie anyị bùtèrè (Matiu 25:46; Jọn 3:36).

Mgbaghara mmehie – olee etu m gà-èsi nwete ya?

Ọ bụ ihe inye èkèle nà Chineke nà-àhụ (anyị) n’anya dịkwa ebere – na-ènwe ọchịchọ ịgbāghàrà anyị mmehie anyị! 2 Pita 3:9 nà-àgwa anyị, “… Ọ nà-àtachiri ụnụ̀ ogologo ntachiobi, n’ihi na Ò zubeghi ka ndị ọbụla laa n’iyì, kama ka mmadụ niile bịa rue nchegharị.” Ọ nà-àgụ Chineke agụụ ịgbāghàra anyị, n’ihi ya, O mèbèrè ọnọ̀dụ maka mgbaghara anyị.

Naanị ǹtàràmahụhụ ziri ezi maka mmehie anyị bụ ọnwụ. Nkera nke mbụ nke Ndị Rom 6:23 nà-èkwuwàpụ̀ta, “n’ihi na ụgwọọlụ nke mmehie bụ ọnwụ…” Ọnwụ ebighi ebi bụ ihe anyị riteworo n’ụgwọ maka mmehie anyị. Chineke, n’ime atụmatụ Ya zuru òkè, ghọ̀ọ̀rọ̀ mmadụ - Jizọs Kraịst (Jọn 1:1, 14). Jizọs nwụrụ n’obe, na-ewère ntaramahụhụ ahụ kwesiri anyị - ọnwụ. 2 Ndị Kọrịnt 5:21 nà-àkụziri anyị, “Onye ahụ Nke nā-amaghị mmehie kà O mere kà Ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ eziomume Chineke n’ime Ya.” Jizọs nwụrụ n’obe, na-ewere ahụhụ kwesiri anyị! Dịka Chineke, ọnwụ Jizọs wepụtara mgbagbara mmehie maka mmehie nke ụwa niile. 1 Jọn 2:2 nà-èkwuwàpụ̀ta, “Ya Onwe Ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie niile anyị, mà Ọ bụghị Ihe ịjụrụ Ya obị banyere naanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama Ọ bụkwa Ihe ịjụrụ Ya obị banyere mmehie nke ụwa dum.” Jizọs siri na ndị nwụrụ anwụ bilie, na-èkwuwàpụ̀ta mmeri Ya n’ebe mmehie na ọnwụ dị (1 Ndị Kọrint 15:1-28). Otuto dịrị Chineke (n’ihi nà) site n’ọnwụ na mbilte n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst, nkera nke abụọ nke Ndị Rom 6:23 bụ eziokwu, “… ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighi ebi n’ime Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”

Ì chọ̀rọ̀ inweta mmehie gị gasị dịka ihe a gbaghààrà? Ị̀ nà-ènwe mmetụta ahụ nā-enyekarị gị nsogbu, nke si n’obì ụtā, nke ọ dịghị kà ị̀ pụrụ ime ya kà ọ pụọ? Mgbaghara mmehie gị bụ ihe a pụrụ inwete mà ọ bụrụ na ị gà-ètinye okwukwe gị na Jizọs Kraịst dịka Onyenzọpụta gị. Ndị Efesọs 1:7 nà-àsị, “Onye anyị sitere n’ọbara Ya nwee mgbapụta anyị n’ime Ya, bụ ngbaghara nke ndahie niile anyị, dịka akụ nke àmàrà Ya si dị.” Jizọs kwụọrọ anyị ụgwọ, n’ihi ya a pụrụ ịgbaghara anyị. Ihe niile i nwere ime bụ rịọ Chineke ka Ọ gbaghara gị site na Jizọs, na-ekwere/kwere nà Jizọs nwurụ iji kwụọ ụgwọ maka mgbaghara mmehie gị - Ọ ga-agbagharakwa gị! Jọn 3:16-17 nwere ozi à dị èbùbè, “n’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, nà O nyere ọbụna Ọkpara Ọ murụ naanị Ya, ka onye ọbụla nke kwere nà Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighi ebi. N’ihi na Chineke eziteghi Ọkpara Ya n’ụwa ka O kpee ụwa ikpe; kama ka e wee site n’aka Ya zọpụta uwa.”

Mgbaghara mmehie - ọ̀ dị̀ m̀fe etu ahụ n’ezie?

Eē, ọ dị̀ mfe etu ahụ! Ị̀ pụghị̀ irite mgbaghara mmehie dịka ụgwọọlụ site n’aka Chineke! Ị̀ gaghị akwụli ụgwọ mgbaghara mmehie gị sitere na Chineke. Site n’amara nà ebere Chineke, Ị pụrụ ịnara ya naanị nnara site n’okwukwe. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnabata Jizọs Kraịst dịka Onyenzọpụta gị wèe nara mgbaghara mmehie site nà Chineke, nke a bụ ekpere i nwere ike ikpe. Ikpe ekpere a maọbụ ekpere ọzọ ọbụla agaghị azọpụta gị. Ọ bụ naanị ịtụkwasị obi na Jizọs Kraịst pụrụ inye/iwepụta mgbaghara mmehie. Ekpere à bụ naanị ụzọ iji gosi Chineke okwukwe gị n’ime Ya ma kelee Ya maka ọnọdụ O mè̀̀̀̀̀bèrè maka mgbaghara mmehie gị. “Chineke, amà m na emehiela m megide Gị ma kwesi (ǹtàràm)ahụhụ. Mana Jizọs Kraịst nààrà (ǹtàràm)ahụhụ ahụ̄ kwesịrị m ka o wee bụrụ nà site n’okwukwe nà Ya e nwere ike ịgbaghara m. Ana m etinye ntụkwasịobi m na Gị maka nzọpụta. Ekele dịrị Gị maka amara na mgbaghara Gị dị ebube! Amen!”

Ọ̀ dịla mkpebì i mèrè nye Kraịst n’ihi ihe ị gụ̀rụ̀là n’ebe à? Ọ bụrụ nà ọ dị etu ahụ, biko kụ̀tụrụ maụ̀sụ̀ nà bọtịn “anabàtala m Kraist taa” dị n’okpuru.

English



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ

Natawo Mgbaghara mmehie? Kedu etu m gà-èsi nata mgbaghara mmehie site na Chineke?
© Copyright Got Questions Ministries