Onye bụ Jizọs Kraịst?




Ajụjụ: Onye bụ Jizọs Kraịst?

Azị̀za:
Nke a adịghị ka ajụjụ “Chineke Ọ̀ dị̀?” sọ mkpụrụ mmadụ olenole nà-àjụ ma Jizọs Ọ̀ dị̀bùrù? Ọ bụ ihe onyeọbụla nabatara nà Jizọs bụ̀bù n’ezie nwoke zọ̄rọ ije n’ala n’Izrel puku afọ abụọ gara aga. E kwuo ā gbaghaa ahụ̀ nà-amàlite mgbe a nà-èkwu maka isiokwu nke èjìrìmara zuru òkè gosipụtara Jizọs. Kà a kpọzie ya nà okpukperechi dum bụ̄ ndị kacha mkpa nà-àkụzi nà Jizọs bụ onyeamụmụ maọbụ ezi onyenkụzi maọbụ nwoke nyefere onwe ya n’aka Chineke, na-efē Ya.

C.S. Lewis, n’akwụkwọ ya ọ kpọrọ Mere Christianity, nà-ède ihe ndị a nā-esote: “ana m agbalị n’ebe à igbochi onyeọbụla ikwū ihe ahụ bụ̄ ihe nzuzù n’ezie nke ndịmmadụ nà-àdị èkwube banyere Ya [Jizọs Kraịst]: ‘adị m nkwadobe inābàtà Jizọs dịka nnukwu onyenkụzi na-akuzi ihe ziri ezi na nke ezighi ezi, mana anaghị m anabata nkụ̀rụ nke Ọ nà-akụ̀rụ ịbụ̄ Chineke.’ Nke ahụ bụ otu ihe anyị agaghị ekwurịrị. Nwoke nke bụ naanị nwoke ma kwuo ụ̀dịdị ihe ndị Jizọs kwuru agaghị abụ nnukwu onyenkụzi na-akuzi ihe ziri ezi na nke ezighi ezi. Ọ gà-àbụ onye isi adịchaghị mma – n’ogo nke nwoke ahụ nọ̀ bụ nke na-asị na ọ bụ àkwa a kpọchuru akpọchu – maọbụ ihe ọzọ abụrụ nà ọ gà-àbụ Ekwensu nke ọkụmmụọ. Ị̀ ghaghị̀ ịgbāra nhọ nke gị. Ọ gà-àbụ nà nwoke à bụ̀bù, ma ka bụrụ, Ọkpara Chineke, maọbụ ihe ọzọ abụrụ na ọ bụ nwoke onyeara maọbụ ihe jọkarịrị njọ. I nwere ike gbachìbìdo ya dịka onyenzuzu, i nwere ike ịbụ̄gara ya asọmmiri ma gbuo ya dịka ajọ mmụọ; maọbụ i nwere ike dàa n’ụkwụ ya ma kpọọ ya Onyenwe anyị na Chineke. Mana ka anyị ghara iwepụta asụsụ enweghi isi nke nledàanya gbasara ya nwa ịbụ nnukwu onyenkụzi bụ mmadụ. Ọ hapụbeghi nke ahụ nye anyị dịka ihe gheere anyị oghe ka anyị si nà ya họrọ. O zubèghì n’obì Ya ime nke a.”

Ebe ọ dị etu a, onye ka Jizọs kụ̀ọ̀rọ̀ nà Ya bụ? Onye ka Akwụkwọ Nsọ nà-àsị na Ọ bụ? Na mbụ, ka anyị lee anya n’okwu ndị nke Jizọs nà Jọn 10:30, “Mụ onwe m nà Nna M bụ otù.” Na mkpị̀nye anyā nke izizi, nke a nwere ike ọ̀ gaghị eyite nkụ̀rụ ịbụ Chineke. Ma etu ọ dị, lee mkpachìgha agwa nke ndị Juu maka okwu Ya, “Ndị Juu zara Ya, sị, ọ̀ bụghị n’ihi ọlụ ọma ka anyị nà-àtụ Gị nkume, kama ọ bụ̀ n’ihi nkwulù; n’ihi kwa na Gị onwe Gị, ebe Ị bụ mmadụ, Ị nà-ème onwe Gị Chineke” (Jọn 10:33). Ndị Juu ghọtara okwu Jizọs dịka nkụ̀rụ ịbụ Chineke. N’amaokwu ndị nā-esote, Jizọs anaghị emekata gbàziere/duzie ndị Jjuu site n’isị̄, “àkụrụ̀ghị̀ M ịbụ Chineke.” Nke ahụ nà-ègosi nà Jizọs nà-èkwu n’eziokwu nà Ọ bụ Chineke site n’ikwūpụ̀tà, “Mụ onwe m nà Nna M bụ otù” (Jọn 10:30). Jọn 8:58 bụ ọmụmaatụ ọzọ: “Jizọs sịrị ha, n’ezie, n’ezie, asị M ụnụ, mgbe a ka amughị Abraham, Mụ onwe M dị!” Ọzọ kwa, na nzaghachi, ndị Juu bukọrọ okwute n’ọchịchọ ka ha tụọ Ya okwute (Jọn 8:59). Jizọs ikwuputa èjìrìmara gosipụtara Ya dịka “abụ m”[lee Baibụlụ Bekee] bụ ntinye aha Chineke nkeTestament Ochie n’ụzọ gara kpoo (Ọpụpụ 3:14). Gịnị mere ndị Juu ga-eji chọọkwa ịtụ̄ Jizọs okwute mà ọ bụrụ nà O kwūbèghìrịị̀ ihe ha kwenyere nà ọ bụ nkwulu, nke aha ya bụ, nkụ̀rụ ịbụ Chineke?

Jọn 1:1 nà-àsị “Okwu ahụ bụrụkwa Chineke.” Jọn 1:14 nà-àsị “Okwu ahụ wee ghọọ anụarụ bụ mmadụ.” Nke a na-egosi n’etu were anya nà Jizọs bụ Chineke nke nọ n’anụahụ. Tọmas onyeozi kwuwàpụ̀tàrà gwa Jizọs, “Onyenwe m nà Chineke m” (Jọn 20:28). Jizọs anaghị eduzi/agbàziri ya. Onyeozi Pọl nà-àkọwa Ya dịka, “…Chineke ukwu ahụ, nke bụkwa Onyenwe anyị, Jizọs Kraịst” (Taịtọs 2:13). Pita Onyeozi na-ekwu otù ihe ahụ̀, “…Chineke anyị nà Onyenzọpụta anyị, Jizọs Kraịst” (2 Pita 1:1). Chineke Nna bụ̀kwùàzì Onyeàma nke èjìrìmara zuru òkè gosipụtara Jizọs, “ma Ọ nà-èkwu ihe banyere Ọkpara ahụ, sị, Ocheeze Gị, Chineke, nadịru mgbe niile ebighi ebi; m̀kpànaka eze nke izi ezi ka m̀kpànaka nke alaeze Gị bụkwa” (Ndị Hibru 1:8). Amụma ndị nke Testament Ochie banyere Kraist nà-èkwuwàpụta chi nke Ya, “n’ihi na a mụwòoro anyị otu nnwa, otu nnwa nwoke kà e nyeworo anyị; ịbụ onyeisi gà-adikwasịkwa n’ubu ya: a gà-àkpọkwa ahà ya Onyeèbùbè, Onyeǹdụ̀mọdụ, Chineke Nke Bụ̄ Dike, Nna Nke Bụ̄ Nna Mgbe Niile Ebighi Ebi, Onyeisi Udo” (Aịsaịa 9:6).

N’ihi ya, dịkà C.S. Lewis siri kọwaa n’okwu, ikwere nà Jizọs bụ̀ naānị ezi onyenkụzi esòghì n’ihe ndị a nà-àgbara nà ǹhọ̀ site n’ọ̀chịchọ onyē. Jizọs, n’etu were anya nà n’agọ̄ghị àgụ̀gọ̀ kụọrọ nà Ya bụ Chineke. Ọ bụrụ nà Ọ bụghị Chineke, n’ọnọ̀dụ à Ọ bụ onyeụ̄gha, n’ihi ya kwa ọ̀ bụghị onyeamụma, ezi onyenkụzi maọbụ nwoke nyefere onwe ya n’aka Chineke, na-efē Ya. Na mgbalị ijì kọwàhìe (kọwaa duhìe) okwu ndị nke Jizọs, “ndịọ̀kàmmụ̀ta” ọ̀gbàràọhụụ nà-àsị nà “Jizọs nke eziokwu dị na mgbe gara aga” ekwughi ọtụtụ ihe Akwụkwọ Nsọ nà-ènyegasị Ya. Ònye kà anyị bụ nà anyị nà Okwu Chineke gà-àgbaghaba okwu banyere ihe Jizọs kwuru maọbụ ihe o kwughi? Kedu etu ‘ọ̀kàmmụ̀ta’ puku afọ abụa wepụrụ nà Jizọs pụrụ isi nwee nghọta dị̄ òmìmì n’ihe Jizọs kwuru maọbụ ihe o kwughi karịa ndị ha na Jizọs bìkọ̀rọ̀, jekọta ozi, Jizọs n’onwe Ya kụzikwaara ha ihe (Jọn 14:26)?

Gịnị mere ajụjụ banyere ezi èjìrìmara gosipụtara Jizọs Kraịst jiri dị mkpà hinne? Gịnị mere o jiri bụrụ ihe e kwesiri ileba anya mà Jizọs Ọ̀ bụ̀ Chineke màọbụ nà Ọ bụghị? Nke kacha mkpa n’ihe kpatara nà Jizọs kwèsị̀rị̀ ịbụ Chineke bụ nà ọ bụrụ nà Ọ bụghị Chineke, ọnwụ Ya agaaraghị ezù ịkwụ̄ ụgwọ ǹtàràmahụhụ maka mmehie ụwa dum (1 Jọn 2:2). Naanị Chineke pụrụ ịkwụ ụgwọ ụdị ǹtàràmahụhụ enweghi ngwụcha ahụ (Ndị Rom 5:8; 2 Ndị Kọrịnt 5:21). Jizọs kwesịrị ịbụ Chineke kà O wee nwee ike ịkwụ ụgwọ anyị ji. Jizọs kwesiri ịbụ mmadụ kà wee nwee ike ịnwụ. A pụrụ inwete nzọpụta naanị site n’okwukwe n’ime Jizọs Kraịst. Chi nke Jizọs kpatara o jiri bụrụ Ya bụ naanị ụzọ nzọpụta. Chi nke Jizọs kpatara O jiri kwuwàpụ̀ta, “Mụ onwe M bụ ụzọ, nà eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onyeọbụla na-abịakute Nna M mà ọ bụghị site nà Mụ” (Jọn 14:6).



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ



Onye bụ Jizọs Kraịst?