Etinyela m okwukwe m nà Jizọs na nwa oge gara aga…ugbua gịnịkwa?




Etinyela m okwukwe m nà Jizọs na nwa oge gara aga…ugbua gịnịkwa?

Turu ùgo! I meela mkpebi nā-agbanwe ndụ! Ikezi ị na-ajụ “ugbua gịnịkwa? Olee etu m ga-esi malite njem mụ na Chineke?” Ǹzọ̀ụkwụ ise a kpọrọ aha n’okpuru ga-enye gị nduzi site n’Akwụkwọ Nsọ. Mgbe i nwere ajụjụ na njem gị, biko gàa nà: www.GotQuestions.org/Igbo.

1. Jìde n’aka nà ị ghọtara (ihe) nzọpụta (bụ).

1 Jọn 5:13 nà-àgwa anyị, “ihe ndị a ka m degaara ụnụ n’akwụkwọ, bụ ndị kwere n’aha Ọkpara Chineke, ka ụnụ wee mara na ụnụ nwere ndụ ebighi ebi.” Chineke nà-àtụ anya n’aka anyị ka anyị ghọta (ihe) nzọpụta (bụ). Chineke nà-àtụ anya n’aka anyị kà anyị nwee nchèkwudo nke ịmaru ya (wee) jide n’aka nà a zọpụtala anyị. Na nkenke, kà anyị gafee n’okwu ndị dị mkpa maka nzọpụta:

(a) Anyị niile emehiela, anyị niile emeela ihe ndị na-anaghị atọ Chineke ụtọ (Ndị Rom 3:23).

(b) N’ihi mmehie anyị, anyị kwesiri ka e jiri ikewapụ anyị na Chineke rue mgbe ebighi ebi wee taa anyị ahụhụ (Ndị Rom 6:23).

(c) Jizọs nwụrụ n’obe iji kwụọ ụgwụ ǹtàràm̀ahụhụ ahụ maka mmehie anyị (Ndị Rom 5:8; 2 Ndị Kọrịnt 5:21). Jisus nwụrụ ọnwụ dịịrị anyị, na-ewere ǹtàràm̀ahụhụ ahụ kwesiri anyị. Mbilite n’ọnwụ ya gosìpụ̀tàrà nà ọnwụ Jizọs zuru ịkwụ ụgwọ maka mmehie anyị.

(d) Mgbaghara mmehie nà nzọpụta kà Chineke nà-ènye ndị niile na-etinye okwukwe ha na Jizọs – na-atụkwasị ọnwụ Ya obi dịka ụgwọ (a kwụrụ maka) mmehie anyị (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:1; Ndị Rom 8:1).

Nke ahụ bụ ozi nke nzọpụta! Ọ bụrụ na i tinyela okwukwe gị na Jizọs Kraịst dịka Onyenzọpụta gị, a zọpụtala gị! A gbagharawo mmehie gị niile, Chineke nà-èkwe nkwà na Ọ gaghị emekata hapụ gị maọbụ gbahàpụ gị (Ndị Rom 8:38-39; Matiu 28:20). Cheta na e chekwabara nzọpụta gị na Jizọs Kraịst (Jọn 10:28-29). Ọ bụrụ na ị na-atụkwasị obi naanị na Jizọs dịka Onyenzọpụta gị, ị pụrụ inwe nchekwudo na gị na Chineke ga-anọ ụwa ebighi ebi n’ime eluigwe.

2. Chọta ezigbo ụka na-akụzi Akwụkwọ Nsọ.

Echèlà banyere ụka dịka otù ụlọ. Ụkà bụ ndịmmadụ. Ọ dị ezigbo mkpa na ndị kwere ekwe n’ime Jizọs Kraịst na-esoro ibe ha na-enwekọrịta mmekọ. Nke ahụ bụ otu n’ime ebumnobi ndị kacha mkpa nke ụka (nzukọ Kraịst). Ugbua i tinyeworo okwukwe gị n’ime Jizọs Kraịst, anyị nà-arịọsi gị ike ka ị chọpụta otù ụka kwere n’Akwụkwọ Nsọ dị n’ebe ị nọ, kpanyekwara ụkọchukwu (onyenchụàjà) ụkà/nkàta. Mee kà ọ mata maka okwukwe ọhụrụ gị n’ime Jizọs Kraịst.

Ebumnobi nke abụọ nke ụka bụ ịkụzi Akwụkwọ Nsọ. Ị pụrụ ịmụta etu e si etinye nkụzi Chineke na ndụ gị. Ịghọta Akwụkwọ Nsọ bụ ọ̀kpọ̀pe ìgòdo (isi sekpụ ntị) dị n’obibi ndụ Kristian bụ nke na-emejupụta atụmanya ya ma dị ike. 2 Timoti 3:16-17 nà-àsị, “Ihe ọbụla e deworo n’ Akwụkwọ Nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru iji zi ihe, na iji tụ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ gugozie, na iji zuputa nzuputa nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zue oke, onye e meworo ka o zuo oke ịlụ ezi ọlụ niile ọbụla.”

Ebumnobi nke atọ nke ụka bụ òfùfè. Òfùfè bụ ikele Chineke maka ihe niile O merela! Chineke azọpụtala anyị. Chineke hụrụ anyị n’anya. Chineke na-enyegasị anyị ihe ndị anyị nwere mkpa maka ha. Chineke nà-èchekwa mà na-eduzi anyị. Olee etu anyị apụghị isi kelee Ya? Chineke dị nsọ, dị eziomume, dị ịhụnanya, dị ebere, ma juputa n’amara. Nkpughe 4:11 nà-èkwuwàpụ̀ta, “Gị Onyenwe anyị nà Chineke anyị, I kwesiri ịnara otuto niile na nsọpurụ niile na ike niile: n’ihi na na Gị onwe gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịịrị, ka e kèkwara ha èkè.”

3. Wepụta oge n’ụbọchị ọbụla iji legide/gbado anya nà Chineke.

Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-èmefù oge n’ụbọchị ọbụla n’ịgbado/n’ilegide anya na Chineke. Ụfọdụ nà-àkpọ nke a “oge jụ̀ụ̀” (kwayet taịm). Ndị ọzọ nà-àkpọ ya “nnyefe (onwe) [divoshọn],” maka nà ọ bụ oge anyị na-enyefe Chineke onwe anyị. Ọ nà-àka amasị ufọdọ iwepụta oge n’ụtụtụ, ebe ndị ọzọ bụ ndị mgbède nà-àkà amasị. Ọ dịghị mkpa bụ ihe ị kpọrọ oge a maọbụ mgbe i ji eme ya. Ihe dị mkpa bụ nà gị na Chineke nà-èmefu oge kwa ụbọchị. Olee iheomume ndị na-emejupụta oge nke anyị na Chineke nọ?

(a) Ekpere. Ekpere bụ naanị ịgwa Chineke okwu. Gwa Chineke okwu maka ihe ndị nā-echekasị gị na nsogbu gị gasị. Rịọ Chineke ka O nye gị amamihe na nduzi. Rịo Chineke ka O wèta ihe ndị dị gi mkpa. Gwa Chineke ụhàrà etu i sidebere hụ Ya n’anya nà uhàrà etu i sidebere ègosi obiụtọ nà ekele maka ọrụ Ya niile Ọ nà-àrụrụ gị. Nke ahụ bụ ihe ekpere bụ maka ya n’uju.

(b) Ịgụ Akwụkwọ Nsọ. N’itenyekwu ihe n’ịkụziri gị Akwụkwọ Nsọ n’ụkà, Sọnde Skuùl, na/maọbụ ọ̀mụ̀mụ̀ Akwụkwọ Nsọ - i nwere mkpa ịdị na-agụ Akwụkwọ Nsọ nye onwe gị. Ihe niile i nwere mkpa ha, iji wee bie ndụ Kristian na-emejupụta atụmanya ya, dị n’Akwụkwọ Nsọ. O nwere nduzi Chineke maka etu e si eme mkpebi zipụtara amamihe, etu e si amata uche Chineke, etu e si enyere ndị ọzọ aka, nà etu e si èto na mmụọ. Akwụkwọ Nsọ bụ Okwu Chineke nye anyị. Akwụkwọ Nsọ bụ n’ezie akwụkwọ nduzi nke nkụzi Chineke maka etu anyị ga-esi bie ndu anyị n’ụzọ na-atọ Ya ụtọ, na-enyekwa anyị afọojuju.

4. Wùlite mmekọrịta n’etiti gị na mmadụ ndị pụrụ inyere gị aka na mmụọ.

1 Ndị Kọrịnt 15:33 na-agwa anyị, “ụnụ ekwela ka e duhie ụnụ: mkpakọrịta niile ọjọọ nà-èmebi omume ọma.” Akwụkwọ Nsọ juputara n’ịdọ aka na ntị maka ike na-agbanwe (ndụ onye ọzọ) [ịnfluens] nke ndịmmadụ “ọjọọ” pụrụ inwe n’ebe anyị nọ. Isoro ha nā-emefu oge, bụ ndị na-etinye onwe ha n’iheomume gasị bụ mmehie, gà-ème anyị ka e were iheomume ndị ahụ nwaa anyị ọnwụnwa. Akparamagwa ndị nọ gburugburu ga-“efèghanye” na anyị. Ya mere o jiri di mkpa hinne ka anyị were ndị ọzọ hụrụ Onyenwe anyị n’anya ma na-enyefe Ya onwe ha, gbaa onwe anyị gburugburu.

Gbalịa ịchọta otù enyi maọbụ abụọ, ikekwe site n’ụka gị, ndị nwere ike inyere gị aka mà na-agba gị ume (Ndị Hibru 3:13; 10:24). Gwa ndịenyi gị ka ha debe gị n’ịna akọwapụtara ha etu ihe si aga n’ihe gbasara oge jụ̀ụ̀ (kwayet taịm) gị, iheomume gị gasị, nà ije gị nà Chineke. Jụọ (ha) mà ì nwere ike imere ha otu ihe ahụ. Nke a apụtaghị nà ị ghaghị ịhapụ ndị enyi niile bụ ndị amaghị Onyenwe anyị Jizọs dịka Onyenzọpụta ha. Gaa n’ihu ịbụ enyi ha hụkwa ha n’anya. Naanị mèe ka ha mata na Jizọs agbanweela ndụ gị, na ị pụghịkwa ime ihe niile ahụ ị nààrà èmebu. Rịọ Chineke ka O nye gị òhèrè gasị ị pụrụ isite na ha wee kwusaa Jizọs nye ndịenyi gị.

5. Mèe baptizim (mmirichukwu).

Ọtụtụ mmadụ na-enwe nghọtàhìe baptizim. Okwu (bekee) ahụ bụ “baptize”(mee baptizim/mmirichukwu) pụtara ịsụ̀kpù na mmiri. Baptizim bụ ụzọ nke Akwụkwọ Nsọ maka ikwuwàpùta n’ihu ọ̀hà okwukwe ọhụrụ gị n’ime Kraịst na ntinye onwe gị n’isò Ya. Akparamagwa nke ịbụ onye a sụkpunyere na mmịri na-eziputa ịbụ onye e likọtara ya na Kraịst. Akparamagwa nke ịpụta na mmiri nà-èsepụta foto nbilite n’ọnwụ Kraịst. Ime baptizim bụ isònyèrè/itikọnye (onwe gị) n’ọnwụ JIzọs, n’òlìlì Ya, nà na mbilite n’ọnwụ (Ndị Rom 6:3-4).

Baptizim abụghị ihe na-azọpụta gị. Baptizim anaghị àsapụ mmehie gị. Baptizim bụ naanị ntụpụ̀ ụkwụ nke nrubeisi, nkwuwàpụtà okwukwe gị naanị n’ime Kraịst maka nzọpụta, nke i mere n’ihu ọ̀hà. Baptizim dị mkpa n’ihi nà ọ bụ ntụpụ̀ ụkwụ nke nrubeisi – na-ekwuwàpụ̀ta n’ihu ọ̀hà okwukwe gị n’ime Kraịst na ntinye onwe gị n’ime Ya. Ọ bụrụ nà ị dị njikere ime baptizim, ị gà-àkpanyere onyenchụaja ụkà/nkàta.



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ



Etinyela m okwukwe m nà Jizọs na nwa oge gara aga…ugbua gịnịkwa?