settings icon
share icon
Ajụjụ

Nwetela Ndụ Ebighi Ebi?

Azị̀za


Akwụkwọ Nsọ nà-egosi ọ̀wàụzọ a nà-àhụchasi ike nā-eduga na ndụ ebighi ebi. Nke mbụ, anyị gà-àmatarịrị nà anyị emehiela megide Chineke: “n’ihi nà mmadụ niile emehiewo, ha adịghị erụkwa otuto Chineke” (Ndị Rom 3:23). Anyị niile emeela ihe ndị anaghị atọ Chineke ụtọ, nke na-eme anyị ka anyị kwesi ntaramahụhụ. Ebe ọ bụ nà mmehie anyị niile, ná ngwụcha ha, megidere Chineke nā-adịgide, naanị ǹtàràmahụhụ nā-adịgide bụ ihe zuoro ya. “n’ihi na ụgwọọlụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighi ebi n’ime Kraịst Jizos Onyenwe anyị” (Ndị Rom 6:23).

Ma etu ọ dị, Jizọs Kraịst, Onye enweghi mmehie (1 Pita 2:22), Ọkpara Chineke na-adịgide ghọ̀ọ̀rọ̀ mmadụ (Jọn 1:1, 14) wee nwụọ iji kwụọ ụgwọ ahụhụ dịịrị anyị. “Ma Chineke na-eme ka ihụnanya nke aka Ya n’ebe anyị nọ pụta ihe, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndịmmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị” (Ndị Rom 5:8). Jizọs Kraist nwụrụ n’obe (Jọn 19:31-42), na-ewère ntaramahụhụ ahụ nke kwesịrị anyị (2 Ndị Kọrịnt 5:21). Mkpụrụ ụbọchị àtọ na-esote, Ya site na ndị nwụrụ anwụ bilie (1 Ndị Kọrịnt 15:1-4), na-egosipụta mmeri Ya n’ebe mmehie nà ọnwụ dị. “Onye mụrụ anyị ọzọ, dịka oke ebere Ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị̄ ndụ, site na mbilite ahụ nke Jizọs Kraist si na ndị nwụrụ anwụ bilie” (1 Pita 1:3).

Site n’okwukwe, anyị gà-àgbanwèrịrị etu anyị si echègara Kraịst echìchè – onye Ọ bụ̀, ihe O mere, nà ihe kpatara ya – maka nzọpụta (Ọlụ Ndịozi 3:19). Ọ bụrụ nà anyị etinye okwukwe anyị nà Ya, na-atụkwasi obi n’ọnwụ Ya n’obe kà ọ kwụọ ụgwọ maka mmehie anyị, a gà-àgbaghàra anyị, anyị anatakwa nkwa nke ndụ ebighi ebi n’ime eluigwe. “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, kaonye ọbụla nke kwere nà Ya wee ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebighi ebi” (Jọn 3:16). “Na ọ bụrụ nà ị gà-ewère ọnụ gị kwupụta Jizọs nà Ọ bụ Onyenwe anyị, ọ bụrụkwa nà ị ga-ewere obi gị kwere nà Chineke mere ka O si na ndị nwụrụ anwụ bilie, a ga-azọputa gị” (Ndị Rom 10:9). Naanị okwukwe n’ime ọrụ ahụ gwụworo agwụ nke Kraịst n’obe bụ naanị ya bụ ọ̀wàụzọ nke eziokwu nā-eduga na ndụ ebighi ebi! “N’ihi na ọ bụ amara ka e jiworo zopụta ụnụ, site n’okwukwe; nke a esiteghikwa n’onwe ụnụ: ọ bụ onyinye Chineke: o siteghi n’ọlụ, ka onye ọbụla wee ghara ịnya isi” (Ndị Efesọs 2:8-9).

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịnabata Jizọs dịka Onyenzọpụta gị, nke a bụ ekpere ọmụmaatụ/nlereanya. Cheta na ikpe ekpere a maobụ ekpere ọbụla ọzọ agaghị azọpụta gị. Ọ bụ naanị ịtụkwasị obi na Kraịst pụrụ ịzọpụta gị site na mmehie. Ekpere à bụ naanị ụzọ iji gosi Chineke okwukwe gị n’ime Ya ma kelee Ya maka ọnọdụ O mè̀̀̀̀̀bèrè maka nzọpụta gị. “Chineke, amà m na emehiela m megide Gị ma kwesi (ǹtàràm)ahụhụ. Mana Jizọs Kraịst nààrà (ǹtàràm)ahụhụ ahụ̄ kwesịrị m ka o wee bụrụ nà site n’okwukwe nà Ya e nwere ike ịgbaghara m. Ana m etinye ntụkwasịobi m na Gị maka nzọpụta. Ekele dịrị Gị maka amara na mgbaghara Gị dị ebube – onyinye nke ndụ ebighi ebi! Amen!”

Ọ̀ dịla mkpebì i mèrè nye Kraịst n’ihi ihe ị gụ̀rụ̀là n’ebe à? Ọ bụrụ nà ọ dị etu ahụ, biko kụ̀tụrụ maụ̀sụ̀ nà bọtịn “anabàtala m Kraist taa” dị n’okpuru.

English



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ

Nwetela Ndụ Ebighi Ebi?
© Copyright Got Questions Ministries