Ajụjụ
Gịnị bụ atụ̀màtụ nke nzọpụta / ụzọ̀ nzọpụta?
Azị̀za
Agụụ ọ̀ nà-àgụ gị? Ọ̀ bụghị agụụ ịgụ n’anụahụ; kama ì nwere agụụ maka ihe ka ukwu na ndụ? Ọ̀ dị̀ ihe dị n’imeīme gị nke anaghị èmekata dịka è metala ya mma? Ọ bụrụ nà ọ dị otu a, Jizọs bụ ụzọ ahụ! Jizọs sịrị, “Mụ onwe M bụ nri na-enye ndụ: onye na-abịakute M agụụ agaghị agụ ya ma ọlị, onye na-ekwerekwa na Mụ, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ mgbe ọbụla” (Jọn 6:35).
Ò jùrù gị anya? Ọ dịghị gị kà ị̀ pụ̀rụ̀ imekata chọta ọ̀wàụzọ maọbụ èbùm̀nobi na ndụ? Ọ̀ nà-àdị gị kà ò nwèrè onye gbanyụrụ ọkụ, ì nwekwaghị ike ịchọta ihe e jị agbanye ya (sụ̀wiìch ya)? Ọ bụrụ nà ọ dị otu a, Jizọs bụ ụzọ ahụ! Jizọs kwuwàpụ̀tàrà, “Mụ Onwe M bụ ìhe nke ụwa: onye nā-eso M agaghị ejegharị n’ọchịchịrị, kama ọ gà-ènwe Ìhe nke ndụ” (Jọn 8:12).
Ọ̀ nà-èmekata ná-èmetụta gị (n’echiche) kà à kpọchìbìdòrò gị pụọ na ndụ? Ị̀ nwàala (wee meghee) ọtụtụ ụzọ, ná-àchọpụ̀ta naanị nà ihe dị ha n’àzụ ghè oghēre bụrụkwa enweghi isi nà ọdụ̀? Ị nà-àchọ ebe e sì abànye na ndụ nā-enye afọōjuju? Ọ bụrụ nà ọ dị otu a, Jizọs bụ ụzọ ahụ! Jizọs kwuwàpụ̀tàrà, “Mụ Onwe M bụ Ọnụụzọ ahụ: ọ bụrụ nà onye ọbụla esi nà Mụ baa, a gà-àzọpụta ya, ọ gà na-abàtakwa, na-apụkwa, na-àhụkwa nri ọ gà-àta” (Jọn 10:9).
Ndịmmadụ ndị ọzọ ànà-eleda gị anya oge niile? Mmekọrịta gị gasị, ọ̀ bụ̀ nà ha adị̄tọghị òmìmì, gheretọkwa oghe? Ọ̀ nà-àdị̀ (gị) kà onye ọbụla nà-èji gị achọrọ ọdịmma nke onwe (ya)? Ọ bụrụ nà ọ dị otu a, Jizọs bụ ụzọ ahụ! Jizọs sịrị, “Mụ Onwe M bụ Onyeọ̀zụ̀zụ̀atụrụ ọma: Onyeọ̀zụ̀zụ̀atụrụ ọma nà-atọ̀gbọ ndụ Ya n’ihi atụrụ Ya. Mụ Onwe M bụ Onyeọ̀zụ̀zụ̀atụrụ ọma; amàkwà̀àrà M atụrụ nke M, atụrụ nke M màkwààrà M” (Jọn 10:11,14).
Ị nà-echègharịba uche ihe ga-eme ma a gafèe ndụ à? Ọ̀ gwụla gị ike ibi ndụ gị nye ihe ndị ga-ere naanị ùre maọbụ gbaa nchāra? Ọ̀ nà-èmebe gị nà oge ụfọdụ ị̀ gaghị ekwetacha nà (ibi) ndụ nwere ihe ọbụla ọ pụtara? Ị̀ chọ̀rọ̀ ịdị ndụ ma ị nwụchaa? Ọ bụrụ nà ọ dị otu a, Jizọs bụ ụzọ ahụ! Jizọs kwuwàpụ̀tàrà, “Mụ Onwe M bụ Nbilite n’ọnwụ na Ndụ: onye na-ekwere na Mụ ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ: ọzọ, onye ọbụla nke na-adị ndụ nke na-ekwerekwa na Mụ, ọ gaghị anwụ ma ọlị rue mgbe ebighi ebi” (Jọn 11:25-26).
Gịnị bụ ụzọ ahụ? Gịnị bụ eziokwu ahụ? Gịnị bụ ndụ ahụ? Jizọs zara, Mụ Onwe M bụ Ụzọ na Eziokwu na Ndụ: ọ dịghị onye ọbụla na-abịakute Nna M ma ọ bụghị site na Mụ” (Jọn 14:6).
Agụụ ahụ nā-agụ gị bụ agụụ nke mmụọ, naanị Jizọs pụkwara ime ka o nwete afọojuju. Naanị Jizọs bụ onye nwere ike ibupu ọchịchịrị ahụ. Jizọs bụ Ụzọ na-eduba na ndụ na-enye afọojuju. Jizọs bụ Enyi na Onyeọ̀zụ̀zụ̀atụrụ ahụ ị nàtọrịị atụ anya ya. Jizọs bụ ndụ ahụ - n’ụwa nke a nà nà nke ọzọ. Jizọs bụ Ụzọ nzọpụta!
Ihe kpatara agụụ jì agụ gị, ihe kpatara i jì dị ka ì furu efu n’ọchịchịrị, ihe kpatara nà ị̀ pụghị ịchọta n’ime ndụ ihe ọ pụtara, bụ maka nà e kewapụrụ gị (pụọ) na Chineke. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị nà anyị niile emehiela, wee bụrụ, n’ihi ya, ndị e kewapụrụ na Chineke (Eklisiastis 7:20; Ndị Rom 3:23). Oghere ahụ ị nà-ènwe mmetụta ya n’ime obi gị bụ Chineke Nke a chọtaghị na ndụ gị. E kere anyị ka anyị na Chineke na-enwe mmekọrịta. N’ihi mmehie anyị, e kewapụrụ anyị na mmekọrịta ahụ. Nke jọkarịrị, mmehie anyị gà-ème anyị ka e kewapụ anyị na Chineke n’ime ụwa ebighi ebi niile, na ndụ nke a nà nke ọzọ (Ndị Rom 6:23; Jọn 3:36).
Ketu etu a pụrụ isi gbòo mkpa à? Jizọs bụ Ụzọ ahụ! Jizọs wèèrè mmehie anyị bo Onwe Ya (2 Ndị Kọrịnt 5:21). Ọ nwụrụ ọnwụ dịịrị anyị (Ndị Rom 5:8), na-ewere ǹtàràm̀ahụhụ kwesiri anyị. Abalị atọ na-esote, Jizọs siri na ndị nwụrụ anwụ bilie, na-egosipụta mmeri Ya n’ebe mmehie na ọnwụ dị (Ndị Rom 6:4-5). Gịnị kpatara O jiri mee ya? Jizọs zara ajụjụ ahụ n’Onwe Ya: “ọ dịghị onye ọbụla nwere ịhụnanya karị nka uku, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya” (Jọn 15:13). Jizọs nwụrụ ka anyị wee nwee ike ịdị ndụ. Ọ bụrụ na anyị tinye okwukwe anyị n’ime Jizọs, na-atụkwasị obi n’ọnwụ Ya dịka ụgwọ mmehie anyị, a nà-àgbaghàra ma sachapụ mmehie anyị niile. Mgbe ahụ anyị ga-enwetezi agụụ nke mmụọ anyị dịka ihe e mere ka ọ kwụsị. A gà-àgbanyegasị ọkụ. Anyị ga-enwe ụzọ isi banye na ndụ na-enye afọojuju. Anyị ga-amara ezi Enyi anyị kachasi mma nà Onyeọzụzụatụrụ ọma. Anyị ga-amara na anyị gà-ènwe ndụ ma anyị nwụchaa – ndụ a kpọlitere site n’ọnwụ, n’ime eluigwe, na-anọnyere Jizọs wee ruo ebighi ebi.
“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya otu a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ naanị Ya, ka onye ọbụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi kama ka o nwee ndụ ebighi ebi” (Jọn 3:16).
Ọ̀ dịla mkpebì i mèrè nye Kraịst n’ihi ihe ị gụ̀rụ̀là n’ebe à? Ọ bụrụ nà ọ dị etu ahụ, biko kụ̀tụrụ maụ̀sụ̀ nà bọtịn “anabàtala m Kraist taa” dị n’okpuru.
English
Gịnị bụ atụ̀màtụ nke nzọpụta / ụzọ̀ nzọpụta?