Chineke Ọ̀ dị̀? È nwèrè ihemgbaàma/ihengosi e nwere maka (igōsìpụ̀tà) ịdị adị Chineke?




Ajụjụ: Chineke Ọ̀ dị̀? È nwèrè ihemgbaàma/ihengosi e nwere maka (igōsìpụ̀tà) ịdị adị Chineke?

Azị̀za:
Ịdị adị nke Chineke bụ ihe a pụghị igosìpụ̀tà maọbụ kwue nà ọ bụ̀ ụgha. Akwụkwọ Nsọ nà-àsị nà anyị gà-ànabàtarịrị site n’okwukwe eziokwu ahụ e mere nnwale nke bụ nà Chineke dị̀: “ma a sị na okwukwe adịghị, ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ ime ihe gā-atọ Chineke ezi ụtọ : n’ihi na onye na-abịakute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ nà-ègosikwa Onwe Ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọọlụ” (Ndị Hibru 11:6). Ọ bụrụ na Chineke chọrọ ya etu ahụ, Ọ pụrụ ịpụta ma gosi ụwa dum na Ọ dị̀. Mana ọ bụru na O mere nke ahụ, à gaghị enwe mkpa ọbụla maka okwukwe. “Jizọs sị ya, n’ihi nà ị hụwo M, ị kwerewo? Ngọzi nà-àdịrị ndị akaàhụghị, ma ha kweere” (Jọn 20:29).

Ma etu ọ dị, nke ahụ apụtaghị na e nweghi ihemgbaàmà/ihengosi e nwere maka (igōsìpụ̀tà) ịdị adị Chineke. Akwụkwọ Nsọ na-èkwupute, “eluigwe nà-àkọ nsọpụrụ Chineke; ọ bụkwa ọlụaka Ya ka mbara igwe na-egosi. Otu ụbọchị nà-àgwawara ụbọchị ibe ya okwu ọnụ n’ụba, otu abalị na-ekwuputakwara abalị ibe ya iheọmụma. Okwu ọnụ adịghị, ọ dịghịkwa okwu dị; a nụghị olu ha. N’ụwa niile ka eriri ọtụtụ ha pụworo jezuo, na nsọtụ elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo” (Abụ Ọma 19:1-4). Ile anya nà kpakpando gasị, ịghọta etu eluuwa dum siri sarue mbara, ịhụgasị iheịtụnanya nke òkìkè, ịhụ mma nke ọ̀dị̀dà anyanwụ (anyanwụ ịdà) – ihe niile ndị a nà-arụ̀ aka n’Onyeòkìkè bụ̄ Chineke. Ǹgààrà ọ bụrụ na ndị a ezughi, e nwekwuaziri ihemgbaàma Chineke n’ime obi anyị gasị. Eklisiastis 3:11 nà-àgwa anyị “…ọzọ, mgbe ebighi ebi ka O tinyeworo n’obi ha.” N’imeime anyị ka ọ dị bụ nrị̀baama nà e nwere ihe dị ma a gafechaa ndụ a, nwekwaa onye dị ma a gafechaa ụwa a. Anyị pụrụ iwere echiche ọgụgụisi gọnahụ/gọnarị nke a, mana nnọnyere Chineke n’ime anyị nà n’ihe niile dị anyị gburugburu bụ ihe a kà nà-àhụchasi ike. N’agbanyeghi nke à, Akwụkwọ Nsọ nà-àdọ aka na ntị nà ụfọdụ kà gà-àgọnarị ịdị̄ adị Chineke: “onyenzuzu asịwo n’obi ya, ọ dịghị Chineke ọbụla dị” (Abụ Ọma 14:1). Ebe ọ bụ nà mmadụ sara mbara, ndị kā n’ọnụọgụ gbasàrà n’akụkọ ntolite niile nke mmadụ, n’omenàlà niile, na mmepe niile, nà na mpaghara mbā ụ̀wà dum kwenyere n’ịdị adị nke ụdị Chineke dị aṅaa, a gà-ènwerịrị ihe (maọbụ onye) na-akpata nkwenye à.

N’ịgbakọnyekwu ihe n’àrụmụkà nke Akwụkwọ Nsọ maka ịdị adị Chineke, e nwere àrụmụkà ndị sitere n’echiche a pịaziri nke ọma (lọjik). Nke mbụ, e nwere arụmụka nke ọntọlọjii (ya bụ ọ̀mụ̀mụ̀ maka ịdị adị na ụdịdị ihe dị adị). Ụdị nke a kacha wee mara n’arụmụka nke ọntọlọjii na-eji ntụpụta echiche bụ nke Chineke iji zipụta ịdị adị nke Chineke. Ọ nà-amàlite nkọwa/nkwuke Chineke dịka “ihe dị adị nke e nweghi ọzọ karịrị ya a pụrụ ichepụta.” O wee kọwapụta okwu ya nà ịdị adị karịrị adịghị adị, n’ihi ya kwanụ ịhe ahụ dị adị kachasị ibe ya gà-àdịrịrị adị. Ọ bụrụ na Chineke adịghị, n’ọnọdụ a Chineke agaghị abụ ihe dị adị a pụrụ ichepute bụ nke kachasị ndị ọzọ niile, nke ahụ agaghị adakọtakwanụ na nkọwa/nkwukè ahụ e nyere maka Chineke.

Àrụmụkà nke abụọ bụ bụ arụmụka gbadoro ụkwụ n’ọ̀mụ̀mụ̀ maka okpukperechi (tìọlọ̀jii). Arụmụka gbadoro ụkwụ n’ọ̀mụ̀mụ̀ maka okpukperechi nà-ekwuputa na ebe ọ bụ nà ụwa dum na-ezipụta èsèrèsè/fòto dị ịtụnanya, a gà-ènwetọrịrị Chineke Ọkwaǹkà. Iji maa atụ, ǹgààrà ọ bụrụ na ala dị nso maọbụ tee aka ka a kpọkwuo ya nàrị̀ maịl olenole n’anyanwụ, ọ gaghị enwe ike ịkwàdòlì ọtụtụ ndụ ndị ọ nà-akwàdo ugbua. Ǹgààrà ọ bụrụ nà ihe ndị gwakọtara ọnụ n’ikuku dị n’elu, jìrì nwantịntị ngụpụta pàseǹt olenole di iche, ọ gààrà àfọdụ obere ka ọ bụrụ nà ọ bụ ihe ọbụla nwere ndụ n’ụwa gà-ànwụ. Ọnụọgụ nke otu mkpụrụ aja (molecule) protìn nke nā-aghọ na ndapụta bụ 1 n’ime 10243 (ya bụ otu 10 nke ihe na-esote ya bụ 234 efù). Ihe mebere otu mkpụrụ seèl (cell) bụ ǹde kwùru n̄de aja(molecules) protin.

Arụmụka nke atọ nke echiche a pịaziri nke ọma (lọjik) maka ịdị adị Chineke ka a nà-àkpọ arụmụka nke kọsmọlọjii (ya bụ ọmụmụ maka ụwa dum). Ihe ọbụla mere gà-ènwerịrị ihe kpatara ya. Ụwa dum à na ihe niile dị ya n’ime ya bụ ihe [e] mere eme. A gà-ènwerịrị ihe mere ihe ọbụla jiri bịa dịrị. Na ngwụcha, a gà-ènwerịrị ihe “e nweghi ihe kpatara ya” ka e wee kpalite ihe ọzọ ọbụla ịdị adị. M̀kpàtàrà ahụ “e nweghi ihe kpatara ya” bụ Chineke.

A maara arụmụka nke anọ dịka arụmụka nke ezi ihe nà ajọ ihe. Omenàla ọbụla n’akụkọ ntolite niile nke mmadụ enweela otu ụdị iwu. Onye ọbụla nwere nghọta nke ezi ihe na ajọ ihe. Igbu mmadụ, ịsị asị, izu ohi, edebeghi iwu ezi àgwà, bụ ihe a jụrụ ajụ ka a kpọzie ya n’ebe ọbụla. Olee ebe nghọta nke ezi ihe nà ajọ ihe à siri bia mà ọ bụghị site na Chineke?

N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na ndịmmadụ ga-ajụ iheọmụma Chineke ahụ doro anya nke a pụghị ịgọpụ ma kwenyere ụgha n’ọnọdụ ya. Ndị Rom 1:25 na-ekwuwàpụ̀ta, “ebe ha weere eziokwu nke Chineke gbanwere ụgha ha, ha wee sọpụrụ na-ekpekwara ihe e kere èkè kama Onye kere eke, Onye a gọziworo ebighi ebi Amen.” Akwụkwọ Nsọ na-ekwuputakwa nà ndị mmadụ enweghi ụsà maka ekwenyeghi nà Chineke: “n’ihi na ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe niile e kere eke, bụ ike ebighi ebi Ya na ụdị Chineke Ya; ka ha ghara inwe ngọpụ” (Ndị Rom 1:20).

Ndịmmadụ na-ekwu na ha na-ajụ ịdị adị Chineke maka nà ọ “dịghị n’ụdị sayens” maọbụ “maka nà è nweghi ihengosipụta ya.” Nke bụ eziokwu bụ ihe kpatara ya bụ nà ozugbo ha kwetere na Chineke dị, ha gà-àghọtakwarịrị nà ha ga-enye nkọpụta ndụ ha n’aka Chineke ma ghọtakwa nà ha nọ na mkpa mgbaghara mmehie n’aka Ya (Ndị Rom 3:23, 6:23). Ọ bụrụ na Chineke dị, n’ọnọdụ a anyị ga-enye Ya nkọpụta maka àgwa anyị gasị. Ọ bụrụ na Chineke adịghị, n’ọnọdụ a anyị nwere ike ime ihe ọbụla anyị chọrọ n’echegbuweghi onwe anyị maka Chineke ikpe anyị ikpe. Ya mere ọtụtụ n’ime ndị ahụ na-ajụ/na-agọpụ ịdị adị nke Chineke jị àmakụ̀dosi ike na ụ̀màndịrị (tiori) nke ‘naturalistic evolution’ (na-asị na ihe dị icheiche topụtara/ghọ̀rọ̀ ịhe ha bụ site n’otu ụdịdị iheokike nke bu ha ụzọ dịrị) - ọ na enye ha ihe ọzọ ha nwere ike ịhọrọ ma ha achọghị ikwere n’Onyeokike bụ Chineke. Chineke dị, n’ọgwụgwụ ihe niile ọnye ọbụla nà-àmara nà Ọ dị̀. Eziokwu ahụ kpọmkwem nke bụ nà ụfọdụ na-eji ike dị̄ egwu na-anwa ikwu nà ịdị adị Chineke abụghị eziokwu, bụ n’eziokwu, arụmụka maka ịdị adị Ya.

Olee etu anyị si ga-āma na Chineke dị? Dịka ndị Kristian, anyị ma nà Chineke dị maka nà anyị nà-agwa ya okwu kwa ụbọchị. Anyị anaghị ànụ n’ụ̀dà ka Ọ nà-àgwa anyị ihe, mana anyị na-enwe mmetụta nke nnọnyere ya, anyị na-enwe mmetụta nke odudu Ya, anyị ma ịhụnanya Ya, anyị nà-àchọba amara Ya. E nweela ihe ndị mere na ndụ anyị enweghi nkọwa ọzọ kwere omume karịkwaa Chineke. Chineke esitela n’oke ọrụebube zọpụta anyị ma gbanwee ndụ anyị nke nà apụghị igbochibido ya kama anyị na-anabata mà na-eto ịdị adị Ya. Ọ dịghị otù n’ime arụmụka ndị a nke pụrụ ime onye ọbụla jụrụ/na-ajụ inabata ihe a hụchasigoro anya ike kà o kwere. Na ngwụcha, ịdị adị Chineke bụ ihe a gà-ànabatarịrị site n’okwukwe (Ndị Hibru 11:6). Okwukwe n’ime Chineke abụghị ịwụnye n’anya ìsì n’ime ebe gbara ọchịchịrị; ọ bụ nzọpụ ụkwụ enweghi mmerụahụ n’ime ọnụụlọ nwere ìhè ọfụma ebe ndịmmadụ sara mbara bụ ndị ka n’ọnụọgụ gùzòwòròrịị̀.



Laghàchi n’ihuakwụkwọ nke jikọtara ndị ọzọ



Chineke Ọ̀ dị̀? È nwèrè ihemgbaàma/ihengosi e nwere maka (igōsìpụ̀tà) ịdị adị Chineke?